1“ ‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
2“ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
3“ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile,
4aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.
5Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu.