28mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
29Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
30Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi.
31Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
32Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya.