Levitikọs 26

nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha

Leviticus 26:41 (UKJV) And that I also have walked contrary unto them, and have brought them into the land of their enemies; if then their uncircumcised hearts be humbled, and they then accept of the punishment of their iniquity:

39Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.

40“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,

41nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha

42aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.

43Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.