Levitikọs 26

Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.

Leviticus 26:39 (UKJV) And they that are left of you shall pine away in their iniquity in your enemies' lands; and also in the iniquities of their fathers shall they pine away with them.

37Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.

38Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.

39Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.

40“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,

41nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.