Levitikọs 26

Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.

Leviticus 26:38 (UKJV) And all of you shall perish among the heathen, and the land of your enemies shall eat you up.

36“ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.

37Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.

38Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.

39Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.

40“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.