Levitikọs 26

Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.

Leviticus 26:37 (UKJV) And they shall fall one upon another, as it were before a sword, when none pursues: and all of you shall have no power to stand before your enemies.

35Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya.

36“ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.

37Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.

38Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.

39Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.