Levitikọs 26

Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.

Leviticus 26:8 (UKJV) And five of you shall chase an hundred, and an hundred of you shall put ten thousand to flight: and your enemies shall fall before you by the sword.

6“ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee.

7Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha.

8Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.

9“ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.

10Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.