7Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
8Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
9“ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.
10Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ.
11Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.