Levitikọs 27

Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.

Leviticus 27:17 (UKJV) If he sanctify his field from the year of jubile, according to your estimation it shall stand.

15Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.

16“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye Onyenwe anyị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise.

17Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.

18Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.

19Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.