Levitikọs 27

Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.

Leviticus 27:19 (UKJV) And if he that sanctified the field will in any way redeem it, then he shall add the fifth part of the money of your estimation unto it, and it shall be assured to him.

17Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.

18Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.

19Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.

20Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ.

21Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.