Levitikọs 27

Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.

Leviticus 27:24 (UKJV) In the year of the jubile the field shall return unto him of whom it was bought, even to him to whom the possession of the land did belong.

22“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro Onyenwe anyị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha,

23onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.

24Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.

25Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.

26“ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.