Levitikọs 27

“ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.

Leviticus 27:26 (UKJV) Only the first born of the beasts, which should be the LORD's first born, no man shall sanctify it; whether it be ox, or sheep: it is the LORD's.

24Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.

25Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.

26“ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.

27Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.

28“ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.