Levitikọs 27

“ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.

Leviticus 27:29 (UKJV) None devoted, which shall be devoted of men, shall be redeemed; but shall surely be put to death.

27Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.

28“ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.

29“ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.

30“ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.

31Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.