Levitikọs 27

Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.

Leviticus 27:4 (UKJV) And if it be a female, then your estimation shall be thirty shekels.

2“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye Onyenwe anyị onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ:

3nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị.

4Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.

5Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.

6A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.