5Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.
6A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.
7Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
8Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
9“ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.