7Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
8Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
9“ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.
10Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ.
11Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.