27“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
28ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
29Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ.
30Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
31Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha.