6Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ.
7Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu Onyenwe anyị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute.
8Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha,
9na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya,
10dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.