Levitikọs 5

“Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.

Leviticus 5:17 (UKJV) And if a soul sin, and commit any of these things which are forbidden to be done by the commandments of the LORD; though he knows it not, yet is he guilty, and shall bear his iniquity.

15“Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.

16Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.

17“Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.

18Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.

19Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.