16Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.
17“Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
18Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.
19Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”