6Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
7“ ‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
8Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.
9Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.
10Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.