4Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
5Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
6Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
7“ ‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
8Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.