2“ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.
3Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.
4Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
5Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
6Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.