Levitikọs 5

“ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.

Leviticus 5:2 (UKJV) Or if a soul touch any unclean thing, whether it be a carcass of an unclean beast, or a carcass of unclean cattle, or the carcass of unclean creeping things, and if it be hidden from him; he also shall be unclean, and guilty.

1“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.

2“ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.

3Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.

4Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.