Levitikọs 6

Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.

Leviticus 6:15 (UKJV) And he shall take of it his handful, of the flour of the food offering, and of the oil thereof, and all the frankincense which is upon the food offering, and shall burn it upon the altar for a sweet savour, even the memorial of it, unto the LORD.

13Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’

14“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.

15Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.

16Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.

17Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.