Levitikọs 6

Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”

Leviticus 6:7 (UKJV) And the priest shall make an atonement for him before the LORD: and it shall be forgiven him for any thing of all that he has done in trespassing therein.

5maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.

6Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.

7Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”

8Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

9“Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.