Levitikọs 6

maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.

Leviticus 6:5 (UKJV) Or all that about which he has sworn falsely; he shall even restore it in the principal, and shall add the fifth part more thereto, and give it unto him to whom it appertains, in the day of his trespass offering.

3maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.

4Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,

5maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.

6Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.

7Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.