Levitikọs 7

A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.

Leviticus 7:2 (UKJV) In the place where they kill the burnt offering shall they kill the trespass offering: and the blood thereof shall he sprinkle round about upon the altar.

1“ ‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ.

2A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.

3Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,

4na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.