19“ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
20A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
21Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’ ”
22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
23“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.