Levitikọs 7

A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.

Leviticus 7:20 (UKJV) But the soul that eats of the flesh of the sacrifice of peace offerings, that pertain unto the LORD, having his uncleanness upon him, even that soul shall be cut off from his people.

18Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.

19“ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.

20A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.

21Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’ ”

22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.