23“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.
24Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ.
25A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
26Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi.
27Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’ ”