3Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,
4na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.
5Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
6Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
7“ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.