Levitikọs 8

Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.

Leviticus 8:11 (UKJV) And he sprinkled thereof upon the altar seven times, and anointed the altar and all his vessels, both the vessel that holds water and his foot, to sanctify them.

9Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.

10Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ.

11Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.

12Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ.

13Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.