Levitikọs 8

O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya

Leviticus 8:25 (UKJV) And he took the fat, and the rump, and all the fat that was upon the inwards, and the lobe above the liver, and the two kidneys, and their fat, and the right shoulder:

23Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.

24Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

25O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya

26O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ.

27O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.