Levitikọs 8

Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.

Leviticus 8:33 (UKJV) And all of you shall not go out of the door of the tabernacle of the congregation in seven days, until the days of your consecration be at an end: for seven days shall he consecrate you.

31Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’

32Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.”

33Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.

34Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.”

35Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.