Levitikọs 8

Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.

Leviticus 8:35 (UKJV) Therefore shall all of you abide at the door of the tabernacle of the congregation day and night seven days, and keep the charge of the LORD, that all of you die not: for so I am commanded.

33Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.

34Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.”

35Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.

36Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu site nʼọnụ Mosis.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.