1Nʼụbọchị nke asatọ, Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị ikom, na ndị okenye Izrel.
2Ọ gwara Erọn sị, “Site nʼime igwe ehi were nwa oke ehi ị ga-eji chụọ aja mmehie. Werekwa ebule na-enweghị ntụpọ ị ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, nke m ga-eche nʼihu Onyenwe anyị.
3Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
4na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ”