Levitikọs 9

tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.

Leviticus 9:20 (UKJV) And they put the fat upon the breasts, and he burnt the fat upon the altar:

18Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.

19Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha,

20tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.

21Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu Onyenwe anyị dịka Mosis nyere nʼiwu.

22Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.