27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri.
28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”
29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara.
30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.
31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.