38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.
40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet.
41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ.
42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.