27Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.”
29Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?”
30Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa.
31Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee.