28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.”
29Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?”
30Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa.
31Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee.
32Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa.