1Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.”
2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa.
3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị.
4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”