21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo.
22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ.
23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
24“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’
25Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma.