23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
24“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’
25Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma.
26Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”
27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.”