39Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche.
40Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya?
41Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.
42“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya.
43“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya.