Luk 11

Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.”

Luke 11:45 (UKJV) Then answered one of the lawyers, and said unto him, Master, thus saying you reproach us also.

43“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya.

44“Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe , nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.”

45Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.”

46Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.

47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.