44“Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe , nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.”
45Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.”
46Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.
47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu.
48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha.