Luk 11

Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu.

Luke 11:49 (UKJV) Therefore also said the wisdom of God, I will send them prophets and apostles, and some of them they shall slay and persecute:

47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu.

48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha.

49Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu.

50Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa,

51site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.