52“Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.”
53Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu,
54na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.